NKE BU EZIGBO EKWENSU

...Nchoputa si na Bible

YouTube version here [] Audio only here [] Home  [] Bible Beziks [Igbo edition] [] 

The Real Devil

...Nchoputa si na Bible

 

Satan, ekwensu, ndi nmo ojoo, Lucifa, nmehie, ihe ojoo... ihe ojoo.  E kwenyere m na otutu madu na-atughari uche banyere ihe ndia n’otu mgbe ma o bu mgbe ozo na ndu ha, mana ha enwetaghi aziza juru ha afo. Ihe onyonyo a gaje ile anya otu Bible siri kowaa isi okwu ndia- n’ihi na a na m agwa unu na Bible bu okwu Chineke. Nime akwukwo nso ka anyi ga-enweta aziza zuru oke nye ajuju ndi anyi na-aju na mkpachapu anya ma o bu na amayi ama. Ihe m choro ikwu bu na Bible na-akuzi na okwu a bu “Satan” putara onye mgbochi, n’ezie, o nweghi onye no na mbara-elu a na-akpo Satan.  O nweghi onye dika Dragon nwere isi asaa na mpi iri no n’eligwe. Ihe ojoo niile na-agba na ndu anyi si na nkwado Chineke.

Nmehie  -eh, nmehie, nsogbu ukwu anyi  -nmehie niile si n’ime obi anyi, n’ime uche anyi. Anyi, n’ezie, bu Satan nye onwe anyi, dika anyi na-ekwu otutu mgbe, anyi bu onye iro ma o bu onye mgbochi ukwu nye onwe anyi. Mgba nmehie na njo bu n’uwa a, eh, n’ime obi na uche ndi madu.

Mana anyi puo n’uzo, e nwere nghota di iche-iche...isi agbago ndi madu gharii.

<Interview>

“ Biko chere...kee ihe I chere banyere “Satan”?”

“Satani? Hiee! E chebeghi m echiche banyere ya. O bu madu?
O kwa a si na o bu nmozi si na 99 storey daa?
Eem...biko o nwere ebe m na-eje!”

“Ngwanu!”

 

“ Biko chere...kee ihe I chere banyere “Satan”?”

“Gini? I siri Satani?”

“Eh, ga n’iru!”

“ Satani...Satani... I ma ihe mere? A maghim. Ihe ojoo na-adabara ndi ojoo na ndi oma...”

“Ndeewo maka oge inyere anyi!”

 

“ Biko chere...kee ihe I chere banyere “Satan”?”

“Hmm, biko e nweghi m okwu!”

“ I meela”

 

“Kedu ihe I chere banyere “Satan”?”

“ I kwenye na Chineke di, I ga-ekwenye n’agiga ozo, agiga ozo nke okpukperechi. I kwenye na Chineke di, kwenye n’ihe oma, I ga e kwenyekwa n’ihe ojoo nke bu agiga nke ozo”

 

“ Biko chere...kee ihe I chere banyere “Satan”?”

“O bu ihe ojoo!”
“Ndeewo!”

“Kedu? Kee ihe I chere banyere “Satan”?”

“Ehm, e cherem nwoke a bu Satan nwere nnukwu obi ojoo, O dika dragon, ehm, O kwesighi I bu enyi m!”

 

“ Biko chere...kee ihe I chere banyere “Satan”?”

“eeh...o bughi ya bu...chetalu m...Lucifa?”
“Ndeewo”

 

I puo n’ezi, ajuju di iche-iche di. Mana madu cheba echiche ime, ihe e chere na Satan bu adabaghi. Ihe m na-ekwu bu na otutu madu kwenyere na Satan bu mo ozi mere nmehie, a chuba ya n’ime Eden ebe o nwara Adam na Eve onwunwa we duba ha na nmehie, nmehie dum si ya n’aka, o bu ya na a kpata ihe ojoo niile na nmehie a na-eme n’uwa. Ndi madu na-ahu Chineke dika “Onye nmezi” ha akpo Satan onye nmebi. Echiche di otua bu naani nta miri aziza nye osimiri ajuju. Nke a bu maka nmehie na njo nwere ike i bu ihe kacha isi ike na ndu madu. Madu niile no n’uwa ugbua, site n’ebe di iche-iche na omenala di iche-iche, ji nwayo na-ejikota si na nghota e nwere banyere Satan e tozughi oke.

 

Nke a bu janet si na New Zealandi:

“ Otu n’ime otutu ajuju m juru bu: Kedu mgbe Ekwensu dara? O bu Tupu e kee uwa? Tupu e kee Adam? Mgbe nka gasiri? Mgbe e buru amuma akwukwo Nkpuhie isi iri na abuo? Oge Noa? Mgbe umu Chineke luru umu nwanyi madu na Genesis is isii?

 

Sonia bu onye ntughari-okwu si na France:

Kedu otu a ga-esi kowa uru si n’aka Satani bia? Bible na-ekwu maka uru ndia- E nyefere ndi madu n’aka Satan ka ha muta ighara ikwulu, otu a ka 1Timoti 1 kwuru; I nyefe n’aka Satan ga-eweta mbibi nke anu aru dika o di na Korinti mbu isi ise. N’ezie, ihe ndia ga-ekwe nghota ma o buru Satan putara onye mmegide, nabughi otu onye si n’eligwe na-eme anyi k’anyi mehie.

 

Charles si na Nigeria:

“E chere m na otutu ndi na mba Africa kwenyere na otu onye di ike a na-akpo Satan. Mana ajuju m bu: Kedu ihe anyi ga-eji busuo Ekwensu ogu? Kedu ihe ga-eme ka o tuo ujo mgbe anyi na-eme ihe dika: Igu Bible, ikpo aha Kraist, ime baptism, ime akara obe, igughari ekpere ma o bu ihe ndi ozo ndi okpukperechi siri ka e mee?”

 

Donald bu onye China:

“Otutu madu obuna ndi uka kwenyere na Satan di. Mana akwukwo ndi Hibru 2:14 kwuru na Jisos e bibiwo ekwensu n’elu obe. Kedu ihe mere nmehie na njo jiri amuba n’elu uwa ma o buru na o bu ekwensu na-eme ihe ndia? O buru n’ezie na e bibiri ekwensu n’obe, n’uzo di aghaa ka nwoke a jiri di ndu taa na-akpa ike ndia? Kedu ka a ga-esi kpee ekwensu ikpe n’ubochi ikpe azu ma o buru na ebibiwoyari n’elu obe?”

 

Josh si na Florida di na U.S.A:

“Eh, o gbagojuru m anya ikwenye na ndi nmo ojoo bu ndi nmozi siri n’elu daa n’uwa inwa madu ma duba ha na nmehie. Nke a o bu maka na o bu Chineke chudara ha? O buru na a chuturu ha maka nmehie ha, kedu ihe mere madu ji ata ahuhu nmehie ha taa? Ihe a o dighi ka ebe i choro ido onye iwe-oku aka na nti, gi nye ya egbe, chuba ya n’ebe umuaka ga-akpasu ya iwe riri nne?”

 

Kelvin si na Brazil:

“ N’ezie, o buru na Chineke kachasi ihe dum ike, e chere m na oghere adizighi nye onye a kporo ekwensu dika e chere. O ga-abu na Chineke nwere ihe dika okara ikike, Satan nwere okara ozo, ha abuo na-ado ndorondo n’eligwe? O nweghi uche di na atumatu a.”

 

Guy si na South Africa:

“Ma o buru na ekwensu adighi, anyi onwere ike ma o bu anyi o ga na-eme nmehie? Aziza gi buru eh, kedu ka ekwensu ga-esi mee ka anyi mee nmehie ma o buru na anyi ga emeghe ma ekwensu adighi.”

 

Steve bu ogu-ego si na England:

“Otutu ndi uka bu odee na-akowa na Chineke kwadoro Satan iru oru. Mana kee ihe mere Bible ji ekwu n’otutu ebe na ihe oghom siri na Chineke bia ma o bu na Chineke zitere ihe ojoo? Aisaia 45 kwuru ebe o doro anya na Ihe na Ochichiri, Ihe-oma na Ihe-ojo n’uzo dika ihe oghom na-esi n’aka Chineke bia. Maika 1 kwuru na “Ihe ojoo si n’ebe Jehovah no bia na Jerusalem” I choo m ga n’iru!”

 

John bu ozu-ahia si na New Zealand:

“ O buru na o di onye bu Satan nke nwere ike inwa madu onwunwa, o ga-enweriri ike na amamihe di ukwuu. Ajuju m bu; kedu ebe o siri nweta odiri ike na ugwu di otu a? O ga-abu n’aka Chineke? O bughi bible kwuru si na ike niile si n’aka Chineke abia? O buru n’ezie na a chudara Satan si n’eligwe, Chineke o hapuru ya ike ukwuu di otu a?”

“Ndeewo”

E nwere m ike itinye otutu ajuju ndi ozo. Ha na-ezitere m ajuju ndia na e-maili m mgbe ha guchara ihe ogugu di na realdevil.info . A ga m acho iguputara gi site n’otu e-maili ndia:

“Ekwensu na ndi nmo ozi ahu o nwere ike icheghari? Ha o nwere ikike ime nmasi onwe ha ugbua? Ha o nwetula odiri ikike a oge gara aga? Oge mbu n’eligwe, ha o di n’odidi Chineke? O buru na Adam mgbe o mere nmehie nwere ike icheghari, gini na-egbochi Satan na ndi nmo ozi ya si n’elu daa dika a na-ekwu, icheghari? Dika Milton dere n’abu Paradise Lost si “Madu ga-enweta amara| Nke ozo (nke bu Satan) ga-agba aka”

Ha juru ezi ajuju ma asi ka m kwue. Mana, kedu ihe bu ihe Bible na-ekwu?
E ji asusu Hibru dee agba ochie Bible, okwu ahu bu “Shatan” putara onye nmegide. K’anyi gee nti ka onye mara Hibru Bible nke oma kowaa ya.

 

“Siteri na mgbochie, e nwere ozizi na-ekwu si na e nwere onye na-esi n’ezi baa n’ime anyi na-eme k’anyi mee nmehie. O bukwa onye ahu na-ebute ihe ojoo niile di n’uwa. Ha na-akpo onye ahu “Satan” mana okwu a putara naani onye nmegide. A na-ede okwu ahu otu a na Hibru: “Shatan”. Okwu a putara naani “onye nmegide”. Okwu a enweghi ihe oma ma o bu ihe ojoo a na-agbkwunye ya. N’agba ohuru, okwu Hibru a bu ‘Satan’ di n’ime ya.

K’anyi lee n’agba ohuru n’Ozi-oma Matiu 16:21:

“Site na mgbe ahu Jisos malitere igosi ndi na-eso uzo ya, na O ghaghi ije Jerusalem, na ihu otutu ahuhu n’aka ndi-okenye na ndi-isi-nchu-aja na ndi ode-akwukwo, na a ghaghi igbu ya, mekwa ka O si n’onwu bilie n’ubochi nke ato. Pita wee kuru ya nye n’aru, malite ibara ya nba, si Chineke ekwela ihe a! Onye-nwe-anyi ihe a agagh-adiri gi ma oli. Ma o chighariri, si Pita, ‘Ga n’azu m, Satan! I bu ihe na-eme ka m ma n’onya n’ihi na echiche gi esighi n’ebe Chineke no bia kama n’ebe madu no”

 

Mgbe Jisos kporo Pita Satan, O bughi n’uche na Pita bu otu nnukwu mmanwu ma o bu dragon nwere ogologo odudu na mpi di ukwu. Mana otutu mgbe n’akwukwo nso, n’agba ochie na n’agba ohuru, anyi ghotara na nmehie na-esi n’ime anyi a puta, o bu ihe a bu onye nmegide ukwu ahu, oke Satan ahu. O bu nke a kpatara na a ga-ekpe anyi ma o bu maa anyi ikpe site n’okwu na n’echiche na n’okwu nke si n’echiche anyi puta. Onye ozi Pol degara ndi Rom akwukwo na Ndi Rom7:15 si:

“ A naghi m aghota ihe m na-eme; nihi na a naghi m eme ihe m choro ime, kama m na-eme ihe m kporo asi. Ebe m na-eme ihe m na-achogh ime, nke a gosiri na mu kwenyere na iwu ziri ezi. O bugh mu na-eme ihe ndia. O bu nmehie nke bi n’ime m.”

Mgbe ufodu, a na-eji okwu a akowa usoro ihe omume na-emegide ihe. Na Nkpuhie isi abuo, anyi gutara na ocheze ma o bu oche ikpe Satan di na pegamos. Nke a na-ekwu maka ikike ndi Rom ndi nwere oche ikpe ha n’obodo Pegamos. A na m ekwu na onweghi onye dika Satan dika otutu siri ghota ya, bi na Pegamos.

 

Nsogbu kachasi ukwu, onye nmegide kachasi ukwu, I cho, gi kpoo ya Satan kachasi ukwu anyi nwere bu aguu nmehie di n’ime anyi. K’anyi ghota ihe a nke oma. Nmehie n’esi n’ime anyi aputa. A choro m iguru gi site na Mark 7. Mark7:15-

“ O dighi ihe obula nke ga-esi n’ezi ba n’ime madu ga-emeru ya; kama ihe si n’ime madu puta bu ihe na-emeru madu...ihe obula nke si n’ezi ba n’ime madu apughi imeru ya; n’ihi na o baghi n’obi-ya, kama n’afo ya...ajo ihe ndia niile na-esi n’ime madu aputa, ha na-emeru madu”

Nke a bu Mark7 site n’amokwu 15 rue 23.

K’anyi gaa n’iru guo James1 site n’amokwu 13-15:

“A na-anwa onye obula mgbe aguu ihe ojoo nke aka ya nadokpufu ya, e wee rafue ya: Mgbe ahu aguu ihe ojoo ahu, mgbe o tuworo ime, o we muputa nmehie: nmehie ahu, mgbo o tozuru oke, o we muputa onwu”

A na m enyere otutu madu choro ikwusi oke mmanya aka, n’ebe a na Latvia, mmanya oku bu oke nsogbu. Otutu ndi aNuruma kwenyesiri ike na o bu ikike si n’ezi ma o bu Satan tibara ha n’onodu ha. Anyi ghota na ‘onwe anyi’ bu nsogbu, na uche madu nwere ike i gbanwe, ya na na obu anyi ga-anata amuma ikpe nmehie anyi- o bu ndia bu eziokwu banyere agha e chere na a na-alu na mmoo. Obu ebe a ka omumu ndi uka ma o bu ozizi uka na-aluputa olu di egwu. Ozizi a bu ihe ha choro ka o gbanwe ndu ndi madu, uche madu na omume madu ebe o di ukwu. O bu nke a mere ihe anyi kwenyere jiri di oke mkpa. Maka na ozizi Bible na-agbanwe ndu anyi. O bu ya mere o jiri di mkpa na anyi ghotara ya nke oma. Ihe I kwenyere na ya na-egosi na ndu gi. Ihe madu kwenyere bu onye ahu.

 

Ndi madu juru ozizi oha banyere Satan e nwerego onwe ha.

Josh, mgbe I ghotara eziokwu banyere Satan, kedu otu o siri metuta ndu gi?

“Nghota a nyere m oghere inwe nghoro. Onwezigh mmoo di ike di egwu na-achizi m. O mere ka m ghota na m nwe nghoro, ikike nghoro. Nmasi omume.”

“O di nma. Nmasi omume. Nwere onwe, I choputawo otutu ihe. Ugbu a John, I dego ma kwue otutu okwu banyere ‘Mgbahara’. Nghota gi banyere Satan ugbua o gbanwere echiche gi na-ebe mgbahara di?

“Eh, O gbanwere. O nyere oke odimiche. Mgbe anyi siri n’onwe anyi “Ekwensu mere m ji me ya! Mgbe ahu anyi na-aju ikwenye na ihe anyi mere na nsogbu o butere ndi ozo. Ozokwa, n’uzo ozo, a na m ekwu  na madu na-agbahara onye mere ihe nmehie, o bughi I rapu ya. Onye ahu si “O bu ekwensu mere o jiri mee m ihe ojoo ahu” I gbahara udi onye ahu ga-esi ike. Chee iru na njo madu mere gi ma gbahara ya njo ahu. E chere m na anyi ga-ewepu ozizi uka banyere Satan n’okwu a”

 

Donald, dika onye si na China, kedu ihe I chere?
“ E chego m otutu ihe banyere okwu a.  
O di m ka anyi na-eme otutu madu ogbanje na e gbughi oge. Anyi na-ebokwasi ha nmehie anyi. Iran na-akpo America “Satan ukwu ahu” O di ka anyi o na-etinye mpi na odu n’aru otutu madu. Mana madu bu madu, o nweghi ihe ozo. Anyi kweta nkeoma na o bu anyi na-emehie dika madu, dika oha, anyi na-eru nso na-ebe eziokwu di. Agwa madu na-akpa ga-eme ka anyi na onye ahu mekoo ihe.”

“Nke a di uto. Janet, tupenye anyi uche gi!”

Otu amokwu na-amasi m bu James 4:7. “ Guzogide ekwensu, o ga-agbapukwa n’ebe unu no” O siri m ike ighota na oke mmoo ga-agbanari anyi na mgba naani maka na anyi gosiri ya aka mgba. Ebe a na-asi na anyi guzogide nmehie di n’ime anyi, nmeri ga-adi mfe”

 

“N’ikpe azu, Charles?”

“E chere m n’otutu kwenyere n’onye a a na-akpo Satan, n’ihi na o na-ewepu anya anyi n’ebe mgba anyi na ime onwe anyi na uche anyi na-agba. O na-eme ka a gasi na anyi di nma, ndi ozo diri ojoo. N’ezie a ga m asi na o na-eme k’anyi chee na anyi di nma karia otu anyi di, anyi ekwenye na o bu onye ozo mere njo anyi”

“Ndeewo”

Mu na enyi m Juris a ruola obere oru, m ga-acho ka o koro anyi akuko okpukperechi ya.

“Eh, o nwe mgbe m kwenyere n’onye a na-akpo ekwensu di. E cheremri na o bu ekwensu ahu na-eme ka m mee njo. Mana e mechara m ghota na odiri ekwensu ahu adighi.

E bighi m ndu dicha nma.

Mgbe m ghotara na o bu m na-eme ihe ndia, ndu m chighariri ma gbanwe.

M  wee chota oru; ndi enyi.

A biara m ghota onwe m nke oma, nke a bu nro onye obula.

Ihe nmuta di na ihe a bu na a nazi m ata onwe m uta na ihe m mere kama i ga chowa onye a na-akpo Satan...

Ndu di ukwu ugbua!

 

Nsogbu kachasi ukwu banyere ozizi ugha Satan bu na o na-eme nmehie a di ntakiri. Ahugo m otutu ndi na-aNusi ihe na-aba n’anya ike na-apughi ikwusi n’ihi na ha chere na o bu Satan ji ha. Mana i ghota na gi onwe gi ji onwe gi, o ga-enye ezigbo aka n’inwe mgbanwe. Anyi a hugo otutu ndi gbanwere ndu ha mgbe ha ghotara eziokwu banyere Satan.

“I chere na ha na-ata Satan uta mgbe ahu?”

“Eh, otua ka ha gwara m, otu a ka ha chere. Na o bughi ha kpatara ya, na o bu Satan. Mana ha na-agbanwe mgbe ha ghotara na Satan ahu adighi, Satan bu onwe anyi. I ji okwu Bible kowaa nghota anyi, a ga m acho i kowaputa oru nghota otu ebe na Bible ga-aruputa. Ndi Hibru 2:14:

“Ebe umu-ntakiri ahu (nke bu anyi) nenweko anu-aru na obara, Ya onwe ya n’otu uzo ahu ketakwara ihe ndia; ka o wee site n’onwu me ka onye ahu ghara idi ire, bu onye nwere ike nke onwu, ya bu ekwensu; ka o wee sitekwa n’onwu naputa ndi ahu (madu), ka ha ra, bu ndi e were egwu onwu tuba n’ibu oru ogologo ndu ha niile”

Jisos diri n’odidi anyi na mbu mere o jiri nwua ka o bibie “ekwensu ahu” Rom 8:3, Rom 8:3 siri na “Chineke...site n’izite nwa ya n’oyiyi nke anu-aru nmehie (nke a bu odidi anyi bu madu)...mara nmehie ikpe n’anu aru”

Nke a na-egosi na ekwensu na nkpali nke nmehie di n’ime anyi bu otu ihe. Amokwu ahu na Ndi Hibru2 siri na ekwensu ji “ike nke onwu” mana Ndi Rom 6:23 dika ebe ndi ozo na Bible siri na o bu nmehie ji ike onwu. Mana Ndi Hibru 2 siri na ekwensu ji ike nke onwu. Nke a bu na nmehie na ekwensu bu otu ihe.

N’ikpe azu, nmehie bu onye uta ukwu anyi. Nmehie gi na-atagi uta, nmehie m na-ata m uta, o bu onye iro m, o na-emegide m. Ozi Jon mbu isi ato na-agwakwa anyi na ekwensu bu nmehie. 1Jon3: “Ihe e ji mee ka okpara Chineke puta ihe bu nka, ka o wee la oru niile nke ekwensu n’iyi”. Mana k’anyi lee amokwu ise otu ebe ahu “ E mere ka Jisos puta ihe ka o bupu nmehie anyi” O siri na e kpughere ya ka o la n’iyi oru niile nke ekwensu. “Nmehie anyi” bukwa olu niile nke ekwensu. Kedu ebe nmehie si abia? Bible gwara anyi na o bu site n’ime anyi. Anyi ga-aza ajuju nmehie anyi. I ma ihe m na-ekwu nke oma ma ichoo ikwu ezi okwu.

Anyi ghota ma kwere na Jisos site n’onwu ya meriri ‘ekwensu’ di ka Bible na-akuzi; anyi lepu anya n’obe Jisos anyi ga-ahu ka ike nke nmehie, ike nke ekwensu bu ihe e gburu n’ime uche zuru oke nke Jisos mgbe o kwudoro n’obe, ozo anyi ghotakwa na anyi ketara oke nmeri kariri nmeri dum mgbe anyi bara n’ime ya site na baptism...mgbe ahu egwu na ihe egwu na-ebute a gaghi adi na ndu anyi. Anyi a gaghi enwe obuna egwu onwu. Anyi nwere ike tuo uzo onwu ujo mana obughi onwu n’onwe ya. Ujo nke amamikpe nke nmehie anyi bu onwu, agaghi adi. N’ihi na e meriwo nmehie n’ime Jisos, anyi no n’ime Jisos ma o buru na e mere anyi baptism nke oma.

A na m echerii na o bu naani anyi nwere odiri nghota a n’ebe Satan di. Mana ahugo m otutu ndi-oke-amamihe na ndi odee na-ekwu otu ihe anyi kwuru. Nke a abughi na anyi na-acho nkwado nke ezi okwu site n’aka ndi a mara aha ha nke oma. E kwere m na ihe ndaba dabara gi ma o bu mu, anyi ga-agbanye uwa azu, guzosie ike mgbe anyi matara na Bible so anyi a ga.

Na otu o di, na nghota anyi, o bu ihe di nma ighota mgbe anyi na-agu akwukwo isi okwu a na otutu madu achoputaawo nchoputa anyi a. Legodinu odee ndi uka a mara nke oma bu Paul Tournier. E chere m na e nwere m akwukwo ya niile na nche-akwukwo m. O foro obere m guchaa ha dum. N’akwukwo ya niile, o kwuru otu ihe ahu –na mgba nke uche madu na-agba bu nke di n’etiti nmehie na ezi-omume; ihe na ochichiri. Nke a bu ihe odee a  a mara nke oma Paul Tournier na-ekwu n’akwukwo ya niile. O nwere otu akwukwo o dere a na-akpo “Ogu ime onwe” ma a tugharia ya. O di nno ka akwukwo odee ozo a mara nke oma, onye  French nwere nmuta banyere ohanaeze, a na-akpo Claude Levi-Strauss, o na-ekwu otu ihe ahu n’akwukwo ya o kporo “Savage mind”. Nke bu nsogbu bu uche anyi, o bughi onye si n’ezi bia, o bu mgba ime onwe nke anyi onwe anyi na-agba.

Akwukwo m bu  “The Real Devil” nke i ga-enweta n’efu na realdevil.info nwere otutu mgbakwunye site na nmuta ndi uka, ndi Psychology, ndi oka nmuta –ha na-ekwu otu ihe ahu. Mana ka m kwue ya ozo, ihe Bible na-ekwu di mkpa karia ihe ndi ozo na-ekwu. Mana a na m ekwu dika madu anyi bu na o bu ihe nkasi obi ighota na ndi ozo kwenyere na ihe anyi na-ekwu.

I chikota okwu onu, a ga m asi na ileba okwu a bu ekwensu anya erubeghi n’uche otutu ndi uka na otutu madu. Echiche di na ndu ma o bu n’obi anyi nke anyi naghotaghi nke oma ga-abu ihe na-achi anyi. Gini na-egbochi gi inyocha echiche a? Uwa anyi bi taa bu nke na-enyocha otu esi eme na mbu, o bu uwa na-agbanwe omenala na ihe ndi ozo.  Lebara isi okwu a anya. N’ihi na onyenweanyi Jisos, mgbe o no n’odidi anyi meriri ike nke onwu. Ikwenye n’ezie na anyi bu oke ndi nmehie adighi ato uto. Anyi agaghi acho ya otu ahu. Anyi achoghi ka-asi na o bu anyi mere ihe a.

Mana nke a bu uzo ezigbo mwere-onwe. Nke bu na onyenweanyi Jisos Kraist nwere odidi anyi, o meririkwara onwu, anyi onwe anyi na-adikwa ka ya site na baptizm, nke a bu ozi-oma nke ozi-oma ahu. O di nno mfe ikpo ndi ojoo ndi ogba nje ma o bu ita ndi ozo uta.

Solzhenitsyn bu onye huru ihe ojoo karia otutu n’ime anyi. O nwere ihe ekwuru banyere ya na The gulag Archipelago nke m ga-acho ka unu nu. O di na Komputa m: “ O buru na o di nno mfe! O buru na...o ga-adi nma iwezuga (ndi ojoo) na etiti anyi ma bibie ha! Mana njo na nma di n’obi anyi –Onye ga-ekwe ibibi mkpuru obi ya?”

O buru na ugbu a ihe onyonyo a na-agwu, I na-eche si “eh! Nke a di uto...” mana gi puo ga luo akpu ma o bu weputa ji n’oba, gi chefue ihe a, aghowo m onye dara ada. Biko e chefula ihe ndia. Anyi kwuru okwu gbasara otu n’ime ihe kachasi mkpa n’okpukperechi nke mbu bu inwe uche ime mmoo, I gbanari onwunwa si n’ime anyi, inwe uche nke Kraist. Biko guo nke oma akwukwo a bu “The Real Devil” o di ebe ahu na realdevil.info . I nwere ike inweta PDF ya ma o bu anyi e zite ya na efu. Biko ezukwala ike rue mgbe e mere gi baptizm nke oma iba n’ime Jisos ka nmeri o meriri nmehie na onwu buru nke gi. N’ezie I ga-enwe ajuju ma o bu mgbagwoju anya. Kpee ekpere maka nke a, zigara anyi e-mail na info@carelinks.net ma o bu i choo ka mu na gi kwuo a na-akpo m Duncan Heaster, e-maili m bu dh@heaster.org. Chineke gozie gi.